Lagos City Marathon: Sintayehu Legese emerịela 'Lagos Marathon' rite $50,000

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Nwaafọ Ethiopia aha ya bụ Sintayehu Legese bụ onye tụụrụ ugo na emume 'Lagos City Marathon' nke anọ.

Legese ritere $50,000.

Legese ji awa abụọ na nkeji iri na asaa gbata onye nke mbụ. Amabeghi ma emeri ya ọ bụ nke kachasị kemgbe ebidoro emume a.

Onye nwaanyị bu ụzọ gbacha bụkwa nwaafo Ethiopia aha ya bụ Meleka Meseret Dinke.

Onye meriri n'afọ gara aga bụ Joshua Kipkorir gbara nke abuọ n'afọ a.

Gideon Goyet bụ onye Naịjirịa mbụ gbachara ya bụ egwuregwu ịgba ọsọ. Goyet ritere nde naira atọ n'emume a.

Onye gbara nke abụọ n'ime ndị naịjirịa ga-erite nde naịra abuọ, onye nke ato ga-erite ndị naira otu.

Emume a bidoro n'ọnu ụtutu taa.