You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lagos City Marathon: Abraham Kiprotich emeriela
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Ka ọ kwadoro inye ndị meriri n'ọsọ a ihe nrite, Gọvanọ Lagos bụ Akinwunmi Ambode kwuru sị "ike agwụla anyị inye ndị si n'ọwụwa-anyanwụ Afrịka ihe nrite a.
"Anyị ga-ebido itinye uju n'ịzụ ndị Naịjirịa ka ha nwee ike imerinwu maratọn."
Kemgbe ebidoro ịgba ọsọ Lagos City Marathon afọ atọ gara aga, ọ bụ ndị sị ọwụwa-anyanwụ Afrịka na-emeri.
Ihe ruru mmadụ puku otu narị sonyere na-ịgba ọsọ Lagos City Marathon nke 2018 nke bidoro ụzọ ụtụtụ taa.
Ndị mmadụ bidoro ịhapụwa ụlọ ha ebe elekere ise nke ụtụtụ, ebe ụfọdụ pụtara ka ndị ọsọ na-agbafe n'agbataobi ha.
Lekwa ihe ndị pụrụiche BBC hụrụ: