You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lagos Maratọn: Ka o siri ga
Agbachaala Lagos maratọn, lekwa ndị meririnụ na usoro ha jiri merie.
Ka a gbara ọsọ maratọn a, ma onye ukwu ma onye nta sonyere na ya.
Nwaafọ Kenya na-anọchite France bụ Abraham Kiprotich bu ụzọ gbaruo na ngwụcha.
Kiprotich, onye gbara ọsọ a n'ime elekere abụọ na nkeji iri na ise na ntabianya anọ, nwetara ihe nrite ọlaedo ma nwetakwa puku dọla iri ise (nde naịra iri na asatọ) bụ ọkpụ ego a na-enye onye mbụ n'ọsọ a.
Ilya Pam bụ nwaafọ Naịjirịa mbụ bu ụzọ gbaruo na ngwụcha ọsọ, Ọ gbara ọsọ a n'ime elekere abụọ na nkeji iri abụọ na asaa. O nwetara nde naịra atọ.
Deborah Pam bụ nwata nwanyị mbụ onye Naijirịa bu ụzọ gbaruo na ngwụcha ọsọ. O nwetara nde naịra atọ.
Herpha Gupta bụ onye Ethiopia, bụ nwaanyị mbụ bu ụzọ gbaruo na ngwụcha ọsọ.
Nwoke a bụ onye mbụ nwere ọlụsị bu ụzọ gafee ngwụcha ọsọ.