You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nigeria 2019 elections: Njirimara ndị na-azọ oche Onyeisiala – Atiku Abubakar
Atiku Abubakar bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị mba Naịjirịa nakwa onye ojiegoachụego bụbụ osote onyeisiala Naịjirịa site n'afọ 1999 rue afọ 2007.
Aha ya na-apụta n'akwụkwọ ntụlịaka ọkwa onyeisiala nke ugboro abụọ dịka Umar Yar'Adua meriri ya n'afọ 2007.
Atiku bụ onye ndọrọndọrọ siri ike, nke pụtara na ọ nọọla na ya ihe ruru afọ iri anọ kemgbe ọ batara n'afọ ndị 80's mgbe ọ si n'ụlọọrụ ndị mbubata na mbupu nke Naịjirịa pụta.
Anya ya bidoro ịbanye n'ọkwa onyeisiala kemgbe afọ 1993 mana onweghi ike ịnwezu vootu kwesiri ịme ka ọ bụra ya ga-ebu ọkọlọtọ pati ya.
N'uche ndị ọnụ na-eru n'okwu, ọ na-eme ka ndị ndọrọndọrọ Afrịca maka etu o sị achụsị ọkwa n'ike. N'agbanyeghi na ọ gbanwela otu ndọrọndọrọ ụfọdụ oge, o mezubeghi uche ya.
Atụrụ Atiku aka n'akụkọ ị na-aka azụ nke mba ofesi gụnyere otu onye omeiwu nke mba Amerịka akpọrọ Williams Jefferson n'agbanyeghị na ọ ọ gọrọ ụka na aka.
Ndị ilo ya na-ekwu na a ga-anwụchi ya ma ọ gaa mba Amerịka ebe ndị otu ya na-ekwu na aka ya adịghị n'okwu ahụ.
Atiku gara Amerịka n'ụbọchị nke 17 ọnwa Janụwarị 2019.
Maazi Abubakar bụ onye ụka alakụba sị na mpaghara ụgwụ Naịjirịa dịka ogbo ya bụ Onyeisiala Muhammadu Buhari.
Ozi achumnta vootu ya na-eleba anya n'iweputa ọrụaka nakwa ịhazi akụnaụba Naịjirịa.
Otu ndọrọndọrọ ya bụ PDP chịrị Naịjirịa afọ iri n'isii mana patị ọhụrụ site na ndị gbakọrọ aka - APC meriri ha nke ọtụtụ mmadụ na-akatọ na ha anaghị emezu ihe iji gboo mkpa ala ahụ bụ ọkụ latrik, mpụ na nchekwa ezighi ezi.
N'uche ndị ọkachamara, ntụlịaka nke ụbọchị 16 n'ọnwa Febụwarị bụ sọsọ n'etiti Atiku Abubakar na onye nọ n'ọkwa ugbua bụ Muhammadu Buhari.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: