You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Logo Benz na egwu ndịọzọ akatọrọ maka na ha kwadoro ihe ọjọọ
Soshala midia nwuru ọkụ ụnyaahụ maka egwu ọhụrụ onye otiegwu Olamide nakwa Lil Kesh wepụtara akpọrọ "Logo Benz".
Nke a bụ maka ụfọdụ ebe ọ dịka ọ kwadoro ọgwụ ego nke na-ewu n'ọnụ ụmụntorobia na Naịjirịa ugbua.
O kwuru n'ime egwu ahụ "ọ bụrụ na ego abataghị, m ga-eme ọgwụ ego o".
Ndị mmadụ dịka Terrybrainz sị na o bụghị ihe dị nma ebe ndị ntorobia na ndị otiegwu nọ
Onye ọzọ dịka @officialdaddymo kwuru na ọ bụghị ihe niile ka a ga-na agụ n'ime egwu
Mana @JajaPhD kwuru na egwu ahụ bụ ihe na-eme n'obodo ka ọ na-ekwu maka ya
Olamide na Lil Kesi o nwebeghi onye pụtara ịkọwa maọbụ kwuo ihe ọbụla maka egwu a.
Lee egwu ndịọzọ agụrụ dịka ha akwadoro ịhe ọjọọ.
- Yahooze - Olu Maintain
- Maga don pay - Kelly Hansome
- Living Things - 9ice
- Wetin we gain - Victor AD
- Science Student - Olamide
Akụkọ ndịọzọ ga-amasị gị