You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Burna Boy na Wizkid aha n'ọgbọ egwu?
Damini Ogulu ama ama dịka Burna Boy na-ewu zi dịka shuga na social media.
Ụnyahụ bụ ụbọchị asa n'ime ọnwa Ọktoba, puku karịrị puku mmadụ pụtara n'ọdọ igbaegwu nke akpọrọ Brixton Academy, O2 Arena na Lọndọn ebe Burna Boy kwere ukwe ya dị iche iche.
Mana ihe ndị mmadụ na-ekwu na social media abụghị sọọsọ na Burna Boy mere ihe puruiche na mmemme a.
@KingNoCulture kwuru na oge eruola ndị mmadụ nyere Burna Boy ugwu ha na-enye ndị oti egwu dịka Wizkid na Davido.
@theayoadams kwadoro ihe @KingNoCulture kwuru n'ozi nke ya.
Alao Ayotunde kwuru na ihe na-atọ ya bụ na Burna Boy anaghị etu ọnụ maka egwu ya maọbụ ego ya.
Mana Burna Boy na Wizkid abụ ọgbọ n'igụ egwu?
@uthman_waxcav n'ime ozi ya kọwara na ọ bụ Wizkid ka ndị mmadụ ji amaatụ oge ọbụla n'ime ndị ga-agụ egwu na Naịjịrịa nke mere Wizkid onye kachasị.
Akụkọ ọzọ pụtara na social media kwuru na gọvanọ Minnesota emeela ụbọchị isii n'ọnwa Ọktoba ụbọchị Wizkid.
Mana Laila kwuru na ihe kachasị mkpa bụ na ọtụtụ ndị otiegwu na Naịjirịa na-ebuli aha ala a nke ọma.
Burna Boy bụ eze ugbua
Agbanyeghị ihe niile ndị na-akwado Wizkid na-ekwu na social media, ndị Burna Boy na-amasị na-eto ya nke ukwu.
Ayoe Blacc dere na site ugbua onweghị onye ga-eneda Burna Boy anya ọzọ.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị