Wizkid Fever: Wizkid ọ bụ iko Tiwa?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ihe onyonyo egwu ọhụrụ a kpọrọ "Fever" nke otiegwu a ma ama bụ Wizkid gụrụ pụtara ụnyaahụ ebutela oke arụmụka n'etiti ndị mmadụ.

Ihe onyonyo egwu a gosiri ebe Wizkid na Tiwa Savage na-afịa onwe ha aka n'ụzọ mmekọrịta nwoke na nwaanyị.

Nke mere Twitter jiri nwuru ọkụ ebe ndị mmadụ na-ajụ ajụjụ dịka "ha abụọ ọ bụ iko ibe ha?" nakwa ajụjụ ndị ọzọ.

Quillon Mazi Nze kwuru na mmekọrịta wizkid na Tiwa abaala ogogo ọzọ.

Ụfọdụ ndị na-akatọ ụdị ọnọdụ a hụtara ha n'ihe onyonyo ahụ karịsịa n'ebe Tiwa Savage nọ dịka ọ bụ onye lụrụla di.

Mike Erezzy sị na ọ bụ ihe ụjọ nye ya na Wizkid ji hụ kpọrọ nkụ akwaso Tiwa Savage iko.

Ebe ndị ọzọ dịka Uchayy na-ekwu na ọ bụ ụdị mmekọrịta a dị n'etiti Wizkid na Tiwa bụ nke ọ chọrọ.

Cheta na nke a abụghị nke mbụ a na-ahụta ha n'ụdị ọnọdụ a bụ nke ha pụtara na Twitter gọọ na ha abụghị iko.

Tiwa Savage lụrụ Tunji Balogun "Tee Billz" n'afọ 2013 ma mụtara ya otu nwa nwoke mana ha nwere nsogbu n'ezinaụlọ ha.

Ebe Wizkid nwere ụmụ atọ site n'aka ụmụnwaanyị dị icheiche ọ lụghị alụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: