Orji Uzọr Kalu : Akwụ m chịm onweghi ihe na-eme

Akụkọ dị mkpa

Aka kwụ m chịm - OUK

Ndị otimkpu aka chịburu Abia Steeti bụ Ọrji Uzor Kalu ekwuola na ahụ dị ya chịmchịm ugbua dịka ọ gwachara ha okwu n'ekwenti n'oge adịghị anya.

Cheta na akụkọ kwuru na nwa amadị mere njem na mba Jamini bụ ebe ọ gara ịwa ahụ n'ihi ọrịa a na-akpọghị aha ya.

Oko osisi ọ daala n'ụlọ Ojukwu?

Akụkọ ọzọ na-eru anyị ntị bụ na Sylvester Dede Ojukwu bụ ọkpara dike Biafra bụ Odumegwu Ojukwu anwụọla n'abalị ụnyaahụ.

BBC Igbo kpọtụrụ nwanne ya nwoke bụ Emeka Ojukwu, okwughi ma ọ bụ eziokwu ka ọ bụ asị kama o kwuru na ọ chọghị ịgwa ndị ntaakụkọ okwu.

Abụbọrụ agaghị egbochi mkparịta ụka anyị - Ngige

Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola na mkparịta ime udo n'etiti gọọmentị na ndị ọrụ ga aga n'ihu echi agbanyeghi abụbụ ọrụ nke ndị ọrụ na-esi ọnwụ ime.

Ngige rọrọ arịrịọ ka ndị niile nke gbasara gbalịa bịa nzukọ ahụ maka i ji gbo nsogbu ọgwụ opekatampe ndị ọrụ.

Na mba Afrịka ọzọ

Akwa dara na mba Ijipt dịka ndị mmadụ gbakọtara ili ndị ụka kraịst asa a gbagburu n'ebe ha gara ikpe ekpere na njem ala nsọ ha mere.

Ndị agha nnupuisi Islamic State kwuru na aka ha dị n'ọnwụ mmadụ asa ndị a.

N'egwuregwu

Manchester United lara na nta dịka ha si na-azụ were ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie ndị AFC Bournemouth n'asọmpi Iko Premier.

N'aka nke ọzọ, anya niile na-ele ka eke ga-esi anya anwụ n'asọmpi ga-adị n'etiti Arsenal na Liverpool n'abalịa.

Nkeji abalị

Ihe nkiri

Leekwa ihe nkiri otu nwoke a sị daa mmiri na Legos

Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ

Oshomhole akụwaala akị oyibo nsugbe n'isi Okorocha

Ibe anyịnụ, pati APC akụwala akị oyibo nsugbe site na inye INEC aha Hope uzodimma dịka onye ga-ebutere pati ha ọkọrọtọ na ndọrọndọrọ ọchịchị gọvanọ Imo Steeti 2019.

Adams Oshiomhole bụ onyeisi APC kwuputara nke a ụbọchị Fraịde bụ ebe ọ nọ kwuo na ihe ya mere bụ ihe ụlọikpe ukwu kwuru.

Mana akụkọ a na-anụzi ugbua bụ na ụlọikpe ukwu dị n'Abuja egbochiela Oshiomole na kọmitee ọrụ nke APC i ziga aha ọbụla na-abụghị aha Uche Nwosu nye ndị INEC.

Ụlọikpe gakwara n'ihu nye ndị INEC iwu ka ha ghara ịna-abata aha ọbụla na abụghị aha Uche Nwosu dịka onye ga-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti.

Ndị ụka Anglican etie kpaa n'Anambra steet

Anyị agaghị ekwe o, Anyị agaghị ekwe!

Ndị ụka Anglikan bụrụ ngagharị iwe ụbọchị frịade bụgara gọvanọ Anambra steeti bụ willie Obiano na ebo ya ebubo na ọ were ụlọakwụkwọ ha bụ Bishop Crowther Primary School nyefee ndị katọlik na'aka.

N'ofesi onyeisiala mba Turkey bụ Recep Erdogan akachiela obi tụọ mba Saudi Arabia aka dị ka ndị gburu Jamal Khashoggi bụ onye nwuru na Turkey.

Chioma:Nchọpụta ndị Turkey mere na-egosi na atọgbụrụ ya bụ nwaamadị bụ onye nọ na ọsọ ndụ ka ọ gara iwete akwụkwọ ikike maka agbam akwụkwụ nwunye ya n'obi nnọchite anya mba ha na Turkey.

N'ofesi, onyeisiala mba Turkey bụ Recep Erdogan akachiela obi tụọ mba Saudi Arabia aka dị ka ndị gburu Jamal Khashoggi bụ onye nwuru na Turkey.

Nchọpụta ndị Turkey mere na-egosi na atọgbụrụ ya bụ nwaamadị bụ onye nọ na ọsọ ndụ ka ọ gara iwete akwụkwọ ikike maka agbam akwụkwụọ nwunye ya n'obi nnọchite anya mba ha na Turkey.

N'egwuregwu

N'egwuruegwu, kepukepu na-eru anyị ntị na-akọ na ndị otu egwu bọọlụ nwere agba na Europe na-agba izu ka ha ga-esi mailte asọmpị ọzọ akpọrọ Super League n'afọ 2021.

Ka ọ dị ugbua onwebeghị ọnye kwere iti aka n'ala na nke a bụ eziokwu bụ ama a akwụkwọ akụkọ Der Speigel gbara.

Gee Nkeji ụtụtụ ebe a

Akụkọ ndị a ga-amasị ịgụ tata