Amara Enyia: Gịnị mere Kanye West na ọtụtụ ndị Amerika ji akwado nwaada Igbo a?

Ebe foto si, Getty Images
Nwoke a ma ama na-eti egwu a kpọrọ Kanye West enyeela nwaanyị aha ya bụ Amara Enyia ego ruru puku narị paụnd iri ise na isii.
Amara Enyia chọrọ iso n'ọsọ ntuliaka mba Amerịka dịka aka ga-achị obodo Chicago nke Bekee kpọrọ "Mayor".
Onye egwu ọzọ a kpọrọ Chance na-akwadokwa ya nke ukwu.

Ebe foto si, Getty Images
Ha kọwara na ha nyere ya ego a ka o jiri kwụọ ụgwụ o ji ndị Illinois State Board of Elections maka ọsọ ọkwa Mayọ ọ gbara n'afọ 2015.
N'ime ozi Enyia zipuru Kanye, ọ kelere ya nke ọma maka nnukwu onyinye ahụ.
Enyia kwuru na ebumnuche ya bụ ị buso mpu na nrụrụaka na obodo ahụ.
Ihe i kwesiri ịma maka Amara Enyia
A mụrụ Amarachukwu Enyia na Baltimore, Maryland na mba Amerịka.
Nne na nna ya bụ ndị Igbo, nna ya bụ ọkammụta na mahadum Governors State University n'obodo ahụ.
Enyia bụ ọkaiwu, bụrụkwa onye ọkammụta n'ihe gbasara agụmakwụkwọ.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị








