Aka uweojii akaparala umụnwoke ndị ha sị na-eri onwe ha na Legọs
Aka akparala ndi uwejii sị bụ umunwoke na-eri onwe ha

Aka akparala ụmụnwoke a sị na-eri ibe ha ebe ha na Legọs. Uweojii sị na ha gbakọrọ na-eme emụme iji nabata ndị ọhụrụ n'Egbeda, Legọs steeti n'ụbọchị ụka gara aga.
Kọmịshọna ndị uweojii na Legọs steeti bụ Edgal Imohimi kwuru na ndị nche ogbe ahụ gbaara ha ama ebe ndị ụmụnwoke ahụ na-agba oringo n'ime abali.
Ọ bụ onu Leah Sharibu nọ n'ekwe ntị

Ebe foto si, Isaac Linus Abrak
Nne na nna nwaada Leah Sharibu ekwuola na ọ bụ onu ya ka anụrụ n'igwe okwu ezigara ndị ntaakụkọ Cable.
Nna Leah Sharibu gwara BBC na ọ bụ onu nwa ya, bụ otu onye fọrọ n'ime umụaka Dapchi nari na iri ndi omekome Boko Haram kpara aka n'afọ a. O kwuru na obi dị ha anụrị na nwa ha ka dị ndụ.
Gụọ akuko a n'uju ebe Ọ bụ olu nwa anyị nọ n'igwe okwu - Ndị nwe Leah Sharibu.
Ndị mmadụ kpụ Trump n'ọnụ

Ebe foto si, AFP
N'Amerịka, akatọrọ onyeisiala ha bụ Donald Trump maka ọ chabịrị ugwu ruru Senatọ John McCain. Trump ewetụghị ọkọrọtọ Amerịka ruo mgbe okwesiri.
Trump na McCain ejighi anya ahụ onwe ha mgbe nwoke ahụ dị ndụ.
N'egwuruegwu,
Sloane Stephens ewerela mmeri na malite US Open nke afọ a ebe o ji ọkpụ abụọ merie ogbo ya nke Russia bụ Eveniya Rodina.

Ebe foto si, robertdeutsch-usatodaysports
N'otu aka ahụ Ezenwaanyị Serena Williams merikwara Magda Linette bụ onye nke ya na ya
kwatara.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Lee ihe nkiri anyị taa











