APC na-achị na gọọmenti okpuru ọchịchị niile n'Imo steeti
APC na-achị na gọọmenti okpuru ọchịchị niile Imo steeti

Ebe foto si, Getty Images
N'Imo steeti, eduola mmadị iri abụọ na asaa iyi ọrụ dịka ndị isioche gọọmenti okpuru ọchịchị nke steeti ahụ.
Cheta na ụnyaahụ, ngalaba ntuliaka kpọrọ aha ndị meriri na ntuliaka ọchịchị ime obodo iri abụọ na asaa dị na steeti ahụ nke ha haziri na Satode agbanyeghị na pati ndị ọzọ esonyeghị mee ya bụ ntuliaka.
PDP ebidola ire akwụkwọ ngosi mmasị ịzọ ọkwa ọchịchị

Ebe foto si, PDP Official Facebook page
Otu PDP amala ọkwa mmalite ire akwụkwọ ngosi mmasị ịzọ ọkwa ọchịchị nke a kpọrọ 'Nomination forms maka ntuliaka 2019.
Akwụkwọ ngosi mmasị ịzọ ọkwa ọchịchị gụnyere nke ọkwa onyeisiala, gọvanọ, ụlọomeiwu ukwu(Senate) ụlọomeiwu nke nta(House of Rep), ụlọ nnọchiteanya nke steeti(House of Assembly.)
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Trump o sị na ndụ afọghị n'ime Buhari?

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Amerika bụ Donald Trump ekwuola na onyeisiala Muhammadu Buhari bụ "onye ndụ adịghị n'ahụ,"na ya achọghị ka ya na-ụdịrị mmadụ dịka Buhari nwe nzụkọ ọzọ.
Ụlọọrụ akụkọ Financial times dere nke a kwuru na Trump gwara ndị ọrụ ya nke a oge ya na Buhari nwere ọgbakọ n'ọnwa Epreelụ.
Akụkọ a pụtara taa na-ewu na soshal midia mana onweghị ọsịsa Buhari nyere maka ya.
Pope Francis ọ ga-ede akwụkwọ arụkwaghị m?

Ebe foto si, Getty Images
N'Afrika, otu ụlọọrụ na mba Kenya na-akpọpụta ụmụnwanyị niile na-ebo ndị ụkọchukwu ebubo na ha tụwara ha ime ka ha bịa mee nyocha n'aka ha iji chọpụta ma ebubo ó bụ eziokwu.
Nke a na-eme dịka ka onyeisi ụka Katolik bụ Pope Francis jụnyụrụ anya ikwu maka onye kwuru ka o tinye akwụkwọ arụkwaghịm maka ebubo na ọ mara otu ụkọchụkwụ na-emetọ ụmụnwata.
Craig Levein agaala ụlọọgwụ

Ebe foto si, Getty Images
Craig Levein bụ aka na-achịkọta otu bọọlụ Hearts nọ ụlọọgwụ ugbua mana ndị ọrụ ya kwuru na- ọ na-agbake.
Ha ekwughị ọrịa buru ya gawa ulọọgwụ.
N'akụkọ yiri ya, Man United na Tottenham ga-asọmpị taa n'asọmpị iko Premier League.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Lee ihe nkiri anyị taa
Nwaanyị ji egwu agwụọ ọrịa











