Ụmụnwaanyị na-agba egwu kama ime ntuliaka n'Imo steeti
Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:
Ntuliaka Imo steeti
N'imo steeti, ọ dịghị ka e mere ntuliaka nke okpuruọchịchị taa ka ndị mmadụ na-agagharị na-eme ihe masịrị ha.
Ụfọdụ ụmụnwaanyị nọ na-agba egwu na-ekwu na ha agaghị eme ntuliaka maka na enwebeghị ihe na-aga ọfụma na steeti ahụ.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ntuliaka okpuru ọchịchị nke Imo steeti: Ọ dịghị ka a na-eme ntuliaka
Delta steeti
Onye bụbu gọvanọ Delta steeti bụ Emmanuel Uduaghan esonyela na ndị gbaghapụrụ otu pati PDP gafee APC.
Ebe ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na o nwere ike ibute ọnwụ PDP na steeti ahụ, ndị APC na-ekwu na Uduaghan ga-abara ha uru.
Na mba ofesi,
A ga-eli ozu Kofi Annan bụbu odeakwụkwọ nke ngalaba United Nations n'ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Septemba, n'ebe a na-eli ndị agha n'obodo Burma dị na mba Gana.

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Gana bụ Nana Akuffo-Addo gwara ezinaụlọ ya ka ha ghara inye onwe ha nsogbu gbasara akwamozu ya, maka na a ga-akwa ya ka onyeisiala.
N'egwuregwu,
Osu ọkpọ Naịjirịa bụ Efe Ajagba mepụrụ Curtis Harper bụ onye mba Amerịka ụjọ ụnyaahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Ajagba meriri na-esughị otu mkpụrụ ọkpọ makana Harper ji ọsọ gbapụ n'ogige ebe ahụ, amabeghị ihe kpatara nke a.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:
Onyeisi ahịa akpụkpọụkwụ dị n'Arịarịa agwala BBC Igbo na ha zuru ka e mee ịrụ akpụkpọụkwụ niile ụmụ Naịjirịa ga-eyinwu.












