Ntuliaka okpuru ọchịchị nke Imo steeti: Ka o si aga

Ntuliaka okpuru ọchịchị nke Imo steeti

Ebe foto si, Ebere Nzewuji

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

N'agbanyeghị na gọọmentị Imo steeti kwuru sị onye ọbụla emepela ahịa maọbụ ọrụ taa, onweghị onye rubere isi n'oku ahụ.

Ụlọahịa dị iche icheBBC Igbo gara na ya na-azụ ka o si azụbu.

N'Okigwe, ọdụ ahịa niile meghere emeghe; etu ahụ ka ọ dịkwa n'okpuruọchịchị Ọnụimo, Isiala mbanọ, mbaitoli nakwa Ihitte Uboma, ndị mmadụ na-agara onwe ha mkpa ha.

Mgbe BBC Igbo rutere na Nkwọ Ụmụezeala dị n'Ehime mbanọ, ahịa ahụ na-azụ dịka onweghị ntuliaka na-eme.

Ahịa Okigwe
Nkọwa foto, Ahịa na-azụ n'Okigwe

Otutu ụmụnwaanyị na-azụ ahịa ebe ahụ gbaara Gọvanọ Rochas Okorocha egwu ngala iji gwa ya na ha agaghị ebinye aka n'akwụkwọ.

Aha onyonyo, Ụmụnwaanyị na-agba egwu kama ime ntuliaka n'Imo steeti

Ruo ugbua, ọtụtụ ụlọakwụkwọ anyị gara bụ ebe ekwesịrị ịnọ mee ntuliaka ka mkpụrụ mmadụ ole na ole nọ na-eche ndị ISEC na-ahụ maka ya.

Ụlọakwụkwọ

Ntuliaka okpuru ọchịchị nke gọọmenti Imo hiwere kwesịrị ime taa n'okpuruọchịchị 27 dị na steeti ahụ n'agbanyeghị ndọrọndọrọ sochiri ima ọkwa ahụ.

Ndị bịara ahịa

Ka BBC rutere n'Okigwe ebe ndị na-edekọta aha, ndị mmadụ jupụtara na-eche ka ISEC bute akwụkwọ ntuliaka.

Okpuru ọchịchị Mbano
Nkọwa foto, Ntuliaka okpuru ọchịchị nke Imo steeti

Ndị ahụ ga-edenye aha ndị Mmadụ n'akwụkwọ na wọọdụ ha dị iche iche gwara BBC na ha anọrọla ebe ahụ kemgbe elekere asaa n'ụtụtụ a.

Mana ruo mgbe o jiri ọkara gafee elekere iri nke ụtụtụ, o nwebeghị onye hụrụ ndị INEC anya.

Ọtụtụ pati anoghị n'ọkwa ọchịchị esonyeghị

Ọtụtụ ndị pati nọ na steeti ahụ esonyeghi na ntuliaka ahụ.

Otu PDP kwuru na aka na ụkwụ ha adịghị ya n'ihi na o nweghị ozi e wetara ha banyere ya.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Otu ọnye ma ihe a na-akọ n'okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'Imo steeti bụ TEO Ekechi,gwara BBC na ntuliaka abụghị ezigbo ya n'ihi na 'mpụ na aghụghọ' emetọọla ya bụ atụmatụ.

Ekechi kwuru na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche n'Imo steeti esepụla aka na ya bụ ntuliaka maka na ha ma na naanị ndị kwadoro gọvanọ Rochas Okorocha bụ ndị ga-enwe mmeri.

Okpuruọchịchị

Mana n'ọsịsa ya, ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Ọkorocha n'okwu gbasara soshal midia bụ Dr Ebere Nzewuji, kwuru na okwu ahụ bụ okwu ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-achịtaghị aja na ntuliaka.

Nzeworji, "Gbaa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị achịtaghị aja na ntuliaka nkịtị.

"APC na pati ndị ọzọ so na ntuliaka a."

Aha onyonyo, Ka o si gaa na ntuliaka Okpuruọchịchị Imo steeti

Akụkọ ga-amasị gị: