Ntuliaka LG nke Imo steeti bụ ezigbo asị -Ekechi
TEO Ekechi bụ otu n'ime ndị kpụrụ okwu n'ọnụ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'Imo steeti agwaala onye ntaakụkọ BBC Igbo na ntuliaka okpuru ochichi Imo steeti nke bekee kpọrọ Local Governement Elections ga-eme n'Imo state taa abụghị ezigbo ntuliaka maka mpụ na aghụghọ emetọọla yabụ emume.
Ekechi kwuru na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche n'ime Imo steeti esepuola aka na ya bụ ntuliaka maka na ha mara na sọọsọ ndị kwadoro gọvanọ Rochas Okorocha bụ ndị ga-enwe mmeri.
Oge BBC Igbo gwara onyeisi ngalaba a bụ Nwoha Amaechi na BBC ga-achọ ị nyocha ihe ga-eme na ntuliaka, o kwuru na ụlọọrọ ya chọrọ sọọsọ mmadụ iri abụọ nakwa na ha enweela ndị mmadụ ruru yabụ akara ọnụ.
BBC Igbo ga-agba butere ụnụ akụkọ niile ga-eme na steeti a taa gbasara ntuliaka a.
Akụkọ ga-amasị gị







