#Freeowerri112: Ihe ji bupu ụfọdụ ụmụnwaanyị Ipob-Ndị ọrụ mkpọrọ

Aha onyonyo, #Freeowerr112: Ihe ji bupu ụfọdụ ụmụnwaanyị Ipob

Madugba James bụ ọnụ na-ekwuru ụlọ mkpọrọ n'Imo Steeti akọwala ihe mere eji bupu ụfọdụ ụmụnwaanyị Ipob gawa n'ụlọ mkpọrọ dị n'Okigwe.

Ọ gwara BBC Igbo na "ọ bụ maka ha karịrị otu narị bụ nke ụlọ mkpọrọ dị n'Owere enweghi ngwa zuru oke eji elekọta ha nille."

"Nke a mere eji buru mmadụ iri n'ime ha gawa ụlọ mkpọrọ dị n'Okigwe ebe a ga-elekọta ha anya dịka ụmụnwaanyị."

Madugba gara n'ihu kwuo na ha ga-enyocha ụmụnwaanyị ndị a ahụ iji chọpụta ndị bu afọime ma ọ bụ ọrịa ndị ọzọ.

O kwuru na ọ bụ iji gbochie ebubo na-ekwu na ọtụtụ ụmụnwaanyị na-atụrụ ime n'ime ụlọ mkpọrọ.

Cheta na ndị uweojii Imo steeti nwụchiri ụmụnwaanyị ndị a karịrị otu narị n'izuụka gara aga ebe ha na-eme ngagharịiwe n'owere.

Akpọpụrụ ha n'ụlọikpe ebe ọkaikpe S.K. Durumba kwuru ka akpọchie ha n'ụlọ mkpọrọ rue ọnwa Seputemba. Ụmụnwaanyị Ipob: Buhari na-achọ nnukwu okwu

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: