Buhari: Onwe ihe ọ chọrọ ị gwa anyi n'ije a o mere taa?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisiala Muhammadu Buhari mere ihe tụrụ ndị mmadụ n'anya ka o ji ụkwụ gaa ihe ruru kilomita narị asatọ taa.

O rituru sonye ndị ji ụkwụ na-aga maka na ndị na-akwado ya nọchichara ụzọ gbochiri ụgbọala ya igafe ka o si ebe ọ gara ekpere maka Sallah na-ala n'ụlọ ya na Daura.

Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuchiri Buhari kwuru na ihe a gosi na ọtụtụ mmadụ hụrụ Buhari n'anya na kwa na ihere ga-eme ndị na-ekwu na Buhari emeela agadị.

Mana emume a Buhari mere taa na-aga ụzọ abụọ na soshal midia.

@Don_Antonio dere na Buhari ji ukwu aga maka uru ọ ga-enye ya n'ahụ, nakwa na ọgaghị akwụsị nsogbu Naịjirịa

@SundayIwalaiye na-agba ajụjụ na ihe a Buhari mere taa ọ bụ uru Demokraci butere Naịjirịa?

@MrIconz na-akụkụ nke ya na-ewe ezigbo iwe na gịnị mere ndị mmadụ ga-apụta na-ekele onye a ji aka ha tinye na-ọkwa ọchịchị dịka onyeisiala?

Mana o nwere ndị ihe a o mere taa na-atọ ka suga.

Mmadụ dịka @AbdulkadirWanka dere na twita na ndị mmadụ ihe niile gbasara Buhari na-amasị nke ọma na-atụ anya nke ukwu.

@adinoyi123 n'uche ya dere na ezi aha keri akụnaụba. Ọ gara n'ihu kperi Buhari ekpere.

Akụkọ ga-amasị gị