You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụlọọrụ Inec enyela izu abụọ iji mechie ndebanye aha maka PVC
Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent Nationa Electoral Commission (INEC) na Bekee ekwuola na ideba aha maka kaadị e ji atụ vootu na ntuliaka ga-akwụsị na abalị 31 ọnwa a bụ Ọgọstụ.
Ndị Inec kwuru nke a ụnyaahụ n'akwụkwọ ha dere nke onye kọmishọna ha bụ Mohammed Kudu Haruna binyere aka.
Ndebanye ahụ kwesiriburu ịkwụsị n'abalị 17 ọnwa mana haruna kwuru na ndị ọhanaeze rịọrọ ka a dọtikwuo ya iji nabata mmadụ niile.
O kwuru na ndebanye aha ahụ ga na-aga n'ihu kwa ụbọchị gụnyere na ngwụcha izuụka naanị ụbọchị ezumike nke obodo ka ọ gaghị adị.
A ga na-eme ya n'ụlọọrụ ndị Inec n'okpuruọchịchị niile dị na Naịjirịa malite n'elekere 9 nke ụtụtụ ruo elekere 5 nke mgbede.
Cheta na steeti dị icheiche tiri iwu dị icheiche iji hụ na ndị steeti ha na-edebanyebeghi aha ga-aga mee ya tupu ọ kwụsị.
Nke a bụ maka na naanị kaadị PVC ka mmadụ nwereike iji mee mbinyeaka na ntuliaka na-abịa n'afọ 2019.
Aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha nyere ụbọchị abụọ n'efu ka ndị mmadụ nwee ike ga debanye aha ha iweta PVC ha.
N'akụkụ nke ya, aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwanyi tiri iwu na ihe ọbụla mmadụ chọrọ iweta na steeti ahụ, ọ ga-egosiriri kaadị PVC ahụ tupu o were ya.
Nke a bụ iji hụ na mmadụ niile pụrụ ga nweta PVC ha.
Ọ kacha mkpa n'ebe ndị Igbo nọ maka na ọtụtụ oge ka ndị Igbo na-ekwu na ha achọghị itu vootu maka na ọ naghị agụ.
Ndị Ipob ekwukwala ka ndị Igbo ghara isonye na mbinyeaka 2019 ahụ mana agbanyeghi nke a, ndị isi obodo, ndị ụkọchukwu n'ụlọụka dị icheiche na ebe ndị ọzọ na-eti mkpu ma na-enye iwu ka ndị mmadụ ga weta PVC ha.