Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: Onye ntọ ejirila Tramadol ṅụtara onwe ya nsogbu
Akụkọ ndị dị mkpa
Ihe ntọ ọchị

Ụwa emebiela o! Onye bịara ịtọ mmadụ emeela ihe a ga-eji cheta ya.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Ondo steeti kwuru na ha nwụchiri ya bụ onye ntọ ka ọ rahụfuru ụra n'ụlọ onye ọ bịara ịtọ maka na ọ ṅụrụ ọgwụ tramadol.
Ndị si APC na PDP pụọ a nọ na nsogbu?

Ebe foto si, Getty Images
Minista na-ahụ maka mgbasa ozi na Naịjirịa bụ Lai Mohammed, ekwuola sị na ndị si otu pati gafee ọzọ mara na ha agaghị agbanarị ikpe ma ọ bụrụ na enyochapụta mmerụaka n'aka ha.
O kwukwara na gọọmentị etiti ka na-enyocha ebubo e boro Kemi Adeosun bụ minista na-ahụ maka akụnaụba, maka asambodo adịgboroja.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ikpe ga-ama onye ikpe ga-ama' - Lai Mohammed
Na mba ofesi,
Onyeisiala ndị Ivory Coast bụ Alassane Ouattara, etiela iwu iji gbaghara Simone Gbagbo bụ nwunye onye chịburu mba ahụ.

Ebe foto si, SIA KAMBOU/AFP/Getty Images
Cheta na Gbagbo gara nga mkpụrụ ọka ebe ọ kwesịrị ịnọ afọ iri abụọ maka itinye ọnọdụ nchekwa steeti na nsogbu.
Iwu a kwuru ka a tọghapụ ya na mmadụ narị asaa na iri itoolu na itoolu ndị ọzọ.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Thibaut Courtois bụ aka na-echere Chelsea goal ọ ka ga-agbara ha? Enwebeghị onye ma ọnọdụ ya maka ihe o mere ụnyaahụ.
Courtois bụ onye ndị mmadụ na-eche ịnụ ma ọ ga-agafe Real Madrid, esoghị ndị otu ya mee nkwado ha mere.
Nkeji ụtụtụ taa
Ihe nkiri nke taa
Ikechukwu Uche kwuru na obi dị ya ụtọ ịgbara Naịjirịa bọọlụ.












