Lee etu nwata nwaanyi a siri gbatia N20,000

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Nwata nwaanyi aha ya bụ Adụfe edeputala ne'elu Twitter ihe oji 20,00 enyi ya nwoke nyere ya were mee.

Dịka o si kwuo, oji 10,00 n'ime ya sir nri, jiri 5,000 gotere enyi ya nwoke akwa ma jiri nke fọrọ tinye ego n'ekwentị ya.

Ụfọdụ mmadụ ekele la ya maka ezi akọ n'uche o gosiri n'iji ego ahụ mee ihe bara uru

@Oyinbolou bụ otu n'ime ndị kelere ya si ya na ọ bụ nwaanyị eji ama atụ

@kolaxsuks kpere ya ekpere ka enyi ya nwoke mata ụdị nwaanyị ọ bụ ma mee ya ihe ọma

Ebe ndị ọzọ katọrọ omume ya

@lurbadeawie zigara ya ozi si ya n'isi adighị ya mma