Akụkọ dị mkpa n'abalị a: Gọvanọ Samuel Ortom nke Benue Steeti awụfela PDP
Onweghi nsogbu dị n'etiti ndị APGA maka Bianca - Nkolagu

Ebe foto si, Getty Images
Dịka akụkọ kwuru na nkwupụta Bianca Ojukwu na ya ga-azọ ọkwa Sinetọ na Anambra-South n'aha pati APGA ga-ebute nsogbu n'etiti ndị APGA, onye bụbu onyeisi oche APGA n'Enugwu steeti bụ Okechukwu Nkolagu ekwuola na enweghi nsogbu nọ na otu ha.
Gọvanọ Samuel Ortom nke Benue Steeti awụfela PDP

Ebe foto si, Getty Images
Gọvanọ Benue Steeti bụ Samuel Ortom ahapụla pati APC wụbanye na PDP site n'akwụkwọ ozi onye enyemaka ya bụ Terver Akase zigara ndị ntaakụkọ.
Ọteela atụwara anya na Ortom ga-ahapụ APC maka nsogbu dị n'etiti ya APC nke Benue Steeti.
Ogbunigwe gbara na Pakistan

Ebe foto si, EPA
Onye ogbunigwe mgbagbu onwe egbuola ihe ruru mmadụ iri atọ na otu n'ogige ebe a na-ebinyeaka dị na Quetta na mba Pakistan.
Ndị agha nnupuisi Islamic Steeti ekwuola na aka ha dị na ogbunigwe a gbara.
N'egwuregwu:

Ebe foto si, Getty Images
Otu Barcelona esila n'azụ ndị AS Roma maburu onye na-agbara otu Bordeaux bọọlụ bụ Malcom n'ọnụ ego dị nde Yuro iri anọ.
Akụkọ kwuru na Roma na Bordeaux ekwerịkọta n'ịzụ Malcom tupu Barcelona agbajie ndị Roma aka n'ịzụ ya.
Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a
Lee ihe nkiri anyị










