Ihe Buhari kwuru maka ndị si APC pụọ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru sị na otu APC ka ga-akwụsị ike n'agbanyeghị na ndị omeiwu ruru 40 si na ya pụọ ụnyaahụ.

O kwukwara na APC anwaala ike ha ịkwụsị ọpụpụ ndị a, ma jaa ndị isi APC mma maka mbọ ha na-agba maka ndịnotu pati a nakwa "mmeri dị n'ihu".

N'ozi Buhari depụtara na Facebook ya, o kwukwara sị ka ndị na-akwado APC ghara ịtụ ụjọ, maka na ụdịrị ọpụpụ a bụ ihe a na-ahụ tupu e mee ntuliaka.

Onụ na-ekwuchitere Buhari n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Garba Shehu, kwuru na Onyeisiala Buhari ebughị ihe ọjọọ n'obi gbasara ndị si APC pụọ.

Shehu tinyekwara ọnụ n'ihe gbasara oku ndị uweojii kpọrọ onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki ụnyaahụ.

O kwuru na gọọmentị etiti ahụla ihe na-eme ma akpọkuo onye ọkwa ya gbalitere.

O kwukwara na iwu obodo metụtara onye niile, na-abụghị naanị ndị ogbenye.

n'ozi o dere na obodo a agaghị enweta ezigbo ọganiihu ma ọ bụrụ na a na-enyo iwu oge ọbụla a kpokuru onye ọbụla ọkwa ya gbalitere.

O kwuru sị na ọrụ ndị nchekwa niile na-etu ha si arụ ya dị n'iwu obodo.

Shehu kwuru na Buhari anaghị etinye ọnụ n'ihe gbasara oku ndị ọrụ nchekwa na-akpọ ndị ha na-enyocha.

O kwukwara na onye ọbụla a chọtara ihe n'aka ya kwesịrị ịga ụlọikpe zara ọnụ ya, karịa ịgakwuru ọha na-eti na a na-emegbu ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: