Anyị enweghi nkewa ọbụla - APC

Agbanyeghi na ụfọdụ ndị mmadụ nọ na pati APC pụtara ụnyaahụ kpọọ onwe ha 'Reformed APC', pati APC apụtala kwuo na ha enweghi nkewa ọbụla.

Akwụkwọ onye na-ahụ maka mgbasa ozi na pati ahụ bụ Mallam Bolaji Abdullahi kwuru na ọ bụ ndị chọrọ ikposa ntụlịaka imeụlọ otu ha bụ ndị mụpụtara otu ahụ.

O kwukwara na ndị na-enye ndị na-achị otu a ga-eduba ha n'ime ọhịa.

Abdullahi kwukwara na ha na-nyocha ma ndị a ha bụ ndị otu APC n'ezie nakwa na ha na-ele kwa otu ọhụrụ a anya ike, tupu ha mara ma ha ga-ekpe ha n'ụlọikpe.

Abdullahi kwusiri ike na APC n'arịọ kwa ndị na-eweso APC nnukwu iwe na ndị na-achị otu a ọhụrụ ga-eleba anya n'iwe ha n'oge eteela aka.

Akụkọ ga-amasị gị