You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụlọikpe akagbuola ntuliaka imeụlọ APC mere n'Imo steeti.
Ụlọikpe ukwu nọ n'Owere, isiobodo Imo steeti akagbuola ntuliaka imeụlọ APC mere na steeti ahụ.
Ọkaikpe Lewis Allagoa nyere iwu ka e megharia ya.
N'ikpe ya, Ọkaikpe ahụ kwuru na mkparitaụka Okorocha na ndị ntaakụkọ nwere nakwa ihe Inec kwuru, APC eweghị ntuliaka imeụlọ n'abalị ise nke ọnwa Mee.
Ọ gwara APC ka ọ gbaa mbọ chekwa ọchịchị onyekwuoucheya site na i megharị ntuliaka ọhụrụ na steeti ahụ.
Na mkparịtaụka BBC na ọnụ na-ekwuchitere gọvanọ Rọchas Okorocha bụ Sam Onwuemedo nwere n'ekwenti, o kwuru na mkpebi ahụ bụ eziokwu.
"Akụkọ ahụ bụ eziokwu. Ụloikpe akagbuola ya ma nye iwu ka e megharịa ya. N'ezie emeghị ntuliaka ọbụla n'Imo steeti."
Cheta na otu nkewa APC na steeti ahụ ndị kwụnyere Okorocha gbara akwụkwọ n'ụlọikpe rịọ ya ka o kpebie na ntuliaka akwadoburu ime n'ọnwa Mee 5, afọ 2018, na akụghị ya isi n'ihi na o nweghị mpụtara ọbụla.
Akụkọ ka na-abịa.