Ntuliaka ime ụlọ APC ataala isi mmadụ abụọ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ogbaghara pụtara na ntuliaka ime ụlọ APC mere eriele isi mmadụ abụọ, otu na Legos nke ọzọ na Delta steeti.

Akụkọ ka na-apụta maka onye nwụrụ na Legos ebe otu nwoke bụ Jeremiah Ojeveta n'azọ ọkwa Chairman na Delta nwụrụ site n'ọgbaaghara taa.

A kagbukwara ntuliaka nke APC mere n'Ekiti maka iji wepụta onye ga-anọchite anya ha n'ọzịzọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ n'ọnwa Julai.

Akụkọ so ntuliaka a bụ na ọgbaaghara dapụtara dịka ndị omekome ji egbe dabatara n'ebe ahụ, ebe ụfọdụ mmadụ na-alụ ọgụ.

Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Cable siri kọwa, ụfọdụ ndị n'azọ ọkwa nnọchite anya a n'ime otu APC were iwe si n'ebe a na-eme ntuliaka pụọ, dịka kọmitii chịkọtara ntuliaka ahụ na-ekwu na o nweghi onye meriri.

Otu APC mere ntuliaka imeụlọ na mpaghara dị icheiche na Satọde maka ịhọpụta ndị ga-achị wọọdụ ga n'ala Naịjirịa.

Kọmiti na-achịkọta emume a na ndị niile na-azọ ọkwa ahụ kwekọrịtara n'ime onwe ha ịkagbu ntuliaka a.

Akụkọ ga-amasị gị