#EkitiElection: A na-ekezi ego n'Ekiti?
Ugo eberela na mgbagbu n'Ekiti steeti, dịka ntuliaka Gọvanọ n'Ekiti steeti na-ebiri ọkụ echi bụ Satọde.
Akụkọ si isi obodo steeti ahụ bụ Ado-Ekiti apụta bụ etu ego si si n'aka na-efere aka dịka ndị na-azọ ọchịchị na-achọ igote ndị ga-atụnyere ha na ntuliaka ga-eme echi.
Onye ntaakụkọ BBC gara mee nyocha n'Ekiti chọpụtara na otu patị dị iche iche ọkachasị PDP na APC na-ama aka onye ego ka dị n'akpa ya dịka ha na-eke ndị mmadụ ego na wọdụ na wọdụ (ward).
BBC hụrụ ọtụtụ ndị mmadụ ka ha na-agba ọsọ na-agbaga n'isi ụlọọrụ wọdụ ha ịketa opekata mpe puku naira anọ (N4,000).

Na mkparịtaụka onye ntaakụkọ BBC nwere, ọ jụrụ ọtụtụ ndị na-agba ọsọ ebe ha na-aga, ọsịsa ha nyere ya bụ ịjụ ya wọdụ ya ma gwa ya ka ọ gaa ebe ahụ ga nara oke N4,000 nke ya.
BBC: "Ebee ka unu na-agbaga?"
Nwaanyị: "Ebee bụ wọdụ gị?"
BBC: "Wọdụ 11"
Nwaanyị: (Tụọ aka) "Gawa ebe ahụ"
BBC: "Gịnị ka ha na-eme ebe ahụ?"
Nwaanyị: "A na-eke ego."
BBC: "Ego ole?"
Nwaanyị: "N4000"
BBC: "Ọ bụ onye ka a sị anyị tụnyere?"
Nwaanyị: "Onye masịrị gị. (Ma wedata olu ya ala) Fayemi."
Ndị ọzọ onye ntaakụkọ BBC jụkwara ajụjụ gosiri na otu PDP sokwa na ndị na-eke ego.
Akụkọ ga amasị gị:











