Akụkọ kachasị n'abalịa a: Yul Edochie abụlụra ojeozi pụruiche n'Anambra steeti
6 Julaị 1967 bụ ụbọchị agha Biafra bidoro

Ebe foto si, Getty Images
Tata bụ Julai 6, afọ iri ise gara aga ka-egbe mbụ bidoro ịda na Biafra na Gakem nke Kros River steeti.
Chris:Ihe dị otu a abịakwalara Igbo ọzọ.
Gọvanọ Ugwuanyi meriri ikpe ya na Ayogu

Ebe foto si, Enugu steeti/Fb
Gọvanọ Ugwuanyị nke Enugwu Steeti emeriela Sinetọ Ayogu Eze n'ụlọikpe kachasị, n'akwụkwọ ọ gbara ka a kagbuo nhọpụta PDP họpụtara Ugwuanyi ịzọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ na 2015.
Bukọla Saraki emeriela Ikpe ya ndị CCT

Ebe foto si, Getty Images
N'otu aka ahụ, ụlọikpe kachasị kagburu mkpebi ụlọikpe mkpegharị n'ebubo na onyeisi Sineti bụ Bukola Saraki ghara ụgha n'ikwupụta akụ ya.
Yul Edochie abụlụra ojeozi ukwu pụruiche n'Anambra steeti

Ebe foto si, Yul/Fb
N'aka nke ọzọ, Yul Edochie akwọla aka iso okenye riwe ihe dị ka Gọvanọ Willie Obialo si họpụta ya ka ojeozi ukwu pụruiche nke steeti ahụ.
N'egwuruegwu Iko mbaụwa
Fransi a taala isi Urogua 2- 0

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu Fransi ji ọkpụ abụọ dula Urugua na asọmpị iko mba ụwa.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Lee ihe nkiri anyị











