Macron: Lee ka onyeisiala mba France na Bill Gates na-asụ 'pidgin'
Onyeisiala mba Frans bịọ́ra Naịjirịa maka ọrụ gwara BBC okwu ebe ọ nọ we tapịa asụsụ Pidgin nke nde kwuru nde mmadụ na-asụ n'ụwa.
Macron jiri ohere ahụ gwa ndị mmadụ na ya gwunyere na Legos, na onweghi ihe na-eme ebe ọ na-enwere onwe ya ọṅụ.
Etu ya bụ onyeisiala bụ onye abụọ afọ ya pekarịsịrị n'ụwa siri tapịa asụsụ ahụ, ị ga na-ajụ ma ọ bụ mbụ ọ na-asụ asụsụ ahụ maka na ọ sụtara ya.
Eziokwu bụ na o nwereike ọ bụrụ na a kuzierela Macron ịsụ Pidgin oge mbụ ọ bịara Naịjirịa ịrụ ọrụ n'afọ 2012.
Oge ahụ, Macron nọrọ ọnwa isii na Naịjirịa. oge a o nwereike ọ bụrụ na o jirila asụsụ ahụ kelee ndị mmadụ maọbụ zụta ihe.
Agbanyeghi na asụsụ Pidgin abụghị asụsụ e ji ede ihe dika nke Bekee kpọro "official language" na Naịjirịa nakwa na mpaghara ọdịda anyanwụ Afịrịka ndị ọzọ, ọtụtụ ndị mmadụ na-asụ ya maka na mmadụ niile na-aghọta ya. O nwereike ike na ọ tara Macron ahụhụ na ọ maghị asụ Pidgin maka na ndị anaghị aghọta asụsụ French na Naịjirịa.
Ndị ọzọ katara ahụ n'ụwa sụrụla asụsụ pidgin bụ onye bụbụ onye kachasị nwee ego n'ụwa ma bụrụkwa onye chọpụtara Microsoft bụ Bill Gates. Lee nke ya ebe a.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post

Akụkọ ndị ga-amasị gị:








