You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị agha na uweojii a ga-akwụsị ịnya ọkada n'Ọka na Ọnisha?
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti bụ SP Haruna Mohammed ekwuola na ndị uweojii n'Anambra Steeti agaghị anya ọgbatumtum na Ọnisha na Ọka dịka iwu ọhụrụ emepụtara na steeti ahụ siri kwụọ.
Haruna kwụkwara na agbanyeghị na ndị ntaakụkọ ụfọdụ na-kpachanye ya nwannu, na ya bụ akụkọ "bụ eziokwu".
Ọ kwetere na "ndị uweojii so bụru ndị ezi amaala nke bụ na ha ga-eso dewe iwu ọbụla etiri na obodo ga-ewete ụdọ".
Ọ sị na ya bụ iwu nke malitere tata gbasara onye ọbụla bị na obodo abụọ ahụ akpọrọ aha.
BBC gbara mbọ ịnweta ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa nke 302 Artillery Regiment, Awka, ka ha kwuo ma ha ekwekwara n'ihe iwu a kwuru mana ekwenti ha nyuru anyu.
Cheta na ụnyahụ ka Kọmishọna na-ahụ maka njem bụ Uchenna Okafor gwara ndị nta akụkọ na malite tata na a ga-amachi ọgbatumtum (okada) ịgba na okporoụzọ Ọka bụ isiobodo Anambra Steeti ya na Ọsha bụ isiazụm ahịa steeti ahụ.
Okafor kwuru na "ya bụ iwu metutara onye ọbụla. Ọnweghị onye ọgụpụrụ".
Ọ sikwa na ha na ndị uweojii na ndị agha akpabiela nke a ma kwekọrịta na ọ bụ ihe ziriezi.
Ọ sị na gọọmenti Anambra kwenyesiri ike na site na iwepụ ọgbatumtum kpamkpam na ụzọ obodo abụọ a, na ihe ruru ndị ekperima 1000 ga-agbapụ na steeti ahụ.
Dika ọgwara ndị nta akụkọ ụnyahụ, "gọọmenti Anambra egotala ụgbọla bọsụ dị 1000 maka inye ndị ezigbo mmadụ bụ ndị ji ịnya ọgbatumtum mere ọrụaka na obodo abụọ a.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
`