You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Inec akwadola ọnọdụ 119,973 maka ntuliaka 2019
Onyeisi ngalaba gọọmenti na-ahụ maka ihazi ntuliaka nke a kpọrọ Inec n'aha ịchafụ bụ ọkammụta Mahmood Yakubu ekwuola na Najiriịa ga-eme ntuliaka na-abịa n'ebe mbinyeaka(pooling booth) 119,973 dịka a ga-ekpokọta mpụtara ha na wọọdụ 8,809.
Inec kwuru na ntuliaka maka ọkwa onyeisiala ga-adị n'abalị 16 nke ọnwa Febrụwarị, afọ 2019, ebe nke ọkwa gọvanọ na ụlọomeiwu nke steeti ga-adị n'abalị abụọ nke ọnwa Maachị
Yakubu kwuru na Inec adịrịla njikere ime ntuliaka nke a na-atụ anya na ihe dịka mmadụ nde iri asatọ debanyereala aha ha n'akwụkwọ ntuliaka ga eso tụọ.
Ọ sịrị: "Ntuliaka abụghị mmemme kama ọ bụ ihe nwere usoro nke ga-ebiri ọkụ tupu ụbọchị ntuliaka. Nkwado ntuliaka na-abịanụ na-ebido na ngwucha ntuliaka e merela."
"O bụ n'ihi nke a, anyị ebidola na ntuliaka 2019 site na iwepụta atụmatụ site n'afọ 2017 rue 2021."
O kwuru na ndị tụnyere ọnụ n'okwu gbasara atụmatụ a gụnyere ndị pati, otu na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye.
Cheta na Muhammadu Buhari ekwupụtala na ọ chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala n'aha otu APC dịka ọtụtụ na-eche na o nwere ike pati ya agaghị enye onye ọzọ karịa ya ohere ịnọchite patị ha.
Atiku Abubakar, Donald Duke, na ndị ọzọ nọ na pati ọzọ na-azọkwa ọkwa onyeisiala Naijiria
Ndị ntorobia pụtakwara ịzọ ọkwa ahụ gụnyere onye bụbu otu na ndị isi n'ụlọakụ etiti a kpọrọ 'Central Bank' na bekee bụ Kingsley Moghalụ, onye ji okwu akpalite mụọ ndị mmadụ(motivational speaker) bụ Fela Durotoye, nakwa Omoleye Sowere, onye nwe Sahara Reporters.