You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lasa Fiva: Anambra Steeti amachiela ịnụ garị
Dịka otu na-ahụ maka ahụ ike mba uwa bụ WHO n'aha ịchafu siri kwuo, ọrịa lasa fiva na-agasa site na iri ihe maọbụ i metụ ihe mamiri maọbụ nsị oke.
Gari bụ nri Naijiria a ma ama nke e si n' akpụ emepụta maka oriri maọbụ ọṅụṅụ.
Ọ bụrụ na e sie garri ọfụma, nje na-ebute lasa fiva ga-anwụ mana ọtụtụ ndị Naijiria na- aṅụ ya aṅụ.
Dr Joe Akabuike, onye bụ Kọmishọna na-ahụ maka ahụ ike n' Anambara Steeti sịrị:"Garị ị na-ahụ ka agbasara ya n'okporo ụzọ mgbe ị na-aga njem dị egwu iri ọkachasị, ịṅịṅụ."
Akabuike gara n'ihu kwue na njem na-ebu ọrịa emerụọla gari dị otu ahụ.
Enwela ọtụtụ ndị mmadụ ọria Lasa fiva tụrụ na Naijiria.
Ụbọchị ụka gara aga, otu dọkịta nwụrụ n'Edo Steeti ka o butechara ọrịa Lasa fiva n'aka nwa ọhụ bu ya o letara.