You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Plateau: Nkwekọrịta Buhari, Saraki na Dogara nwere
Onyeisiala Buhari na ndị isi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki na Yakubu Dogara nwere mkparịta ụka taa.
Onyeisiala kọwara ndị isi ụlọomeiwu ihe ndị ọ na-eme i ji gboo nsogbu nchekwa dị na Naịjirịa ugbua.
Na ngwụcha nzụkọ ha, onyeisi ụlọomeiwu ntaa bụ Yakubu Dogara gwara ndị ntaakụkọ na okwu nchekwa abụghị okwu a na-ekwuputa n'ihu ọha.
Ọ gara n'ihu kwuo na onyeisiala gwara ha na ọ ga-ekpogharị nchekwa ala Naịjirịa.
O kwuru na agbanyeghi na ugbu a bụ oge iri uju, na ndị Naịjirịa agaghị a na-abata ọnọdụ enweghị nchekwa.
Dọgara n'aha ndị ụlọomeiwu zigara ezinaụlọ ndị ihe a metụtara ozi iti aka n'obi.
Onyeisiala Mohammadu Buhari kwupụtara nzụkọ ahụ site n'akara twitter ya.
Mkparịta ụka ha na-abịa n'ime abalị anọ awakpochara ụfọdụ ndị mmadụ ma gbuo ihe ruru iri asatọ na isii na Plateau steeti.