You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
DSS ahapụla Abaribe, ọ ga-alaghachị ọrụ taa
Ọ bụ n'ọnụ onye na-ekwuchitere ya n'ihe gbasara mgbasaozi bụ Uche Awom ka ọ sị zie ozi a.
Ọ gwara BBC na ọ bụ ebe elekere isii n'ọma nke mgbede ka Abaribe nwereonwe ya n'aka ndị DSS jichiri ya kemgbe ụbọchị ise".
E nyere Abaribe ihe a kpọrọ 'administrative bail' na Bekee ma nyekwa ya n'aka ndị ọkaikpe na-anọchị anya ya, onye ndu ha bụ okaikpe ukwu Chukwuma-Machukwu Ume.
Ụfọdụ ndị mmadụ na-aṅụrị maka mwereonwe Abaribe ma na-egosi ya na soshal midia.
A nwụchịrị Abaribe n'ehihie ụbọchị Juunu 22 n'ekwughị ihe mere e jiri nwụchịe ya ma gakwa n'ụlọ ya ịme nyocha.
Anụkwara kepu kepu na ụfọdụ ndị so Abaribe gbochiri ndị DSS ịkpụrụ ya pụọ mgbe onye ọkaikpe ukwu nyechara ịkpe ya ụnyaahụ.
Awom gwara BBC na ihe ndị so ya na-achọ bụ ịmaata ihe o mere e jiri nwụchie ya ma nyekwa ohere ịkwuchite ọnụ ya.
Ọ sị na ndị DSS jụrụ ịnye ya bụ ohere ma zakwa ajụjụ ihe ha jiri nwuchie ya, ha mechara si n'azụ ụlọ zupu ya n'ụlọikpe ahụ.
Mana ụlọikpe tinyere ụbọchị 14 ọnwa Nọvemba maka ikpe Nnamdi Kanu.
BBC Igbo ka na-agba mbọ ị nụ olu ndị DSS n'ihe gbasara okwu a.