You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Plateau: Buhari mee ihe karịrị ozi itiakanobi
Ndị uweojii kwuru na mmadụ ruru iri asatọ n'isii anwụọla n'ọgụ dara n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụụgbo na Platu steeti.
Ya mere onyeisiala bụ Muhamadu Buhari jiri zigara ndị steeti ahụ ozi itiakanobi iji kasie ha obi maka ihe mwute a mere.
N'ime ozi ya, o kwuru na ọ ga-agba mbọ ịhụ na a nwụchiri ndị mere nke a ma kpee ha ikpe ka o si kwesi.
Mana obi adịghị ọtụtụ ndị mmadụ mma maka akụkọ a ebe ha gosiri iwe ha n'elu soshal midia.
@Renoomokri kwuru na ọ dịka Buhari ezitere ozi ochie ya n'agbanweghị ihe ọbụla n'ime ya.
@es_adelore kwuru ka gọọmentị etiti mee ihe karịrị izi sọsọ ọzị kwa izuụka ihe mere.
@Terna71 kwuru na ọ bụ otu ozi a ka Buhari kpụ n'ọnụ kemgbe ndị Benue na-anwụ.
@AlphamaleSMG kwuru na Buhari na-akwado ịme njem na Kalaba kama ị ga leta ndị Platu steeti.
Ozi ndị Buhari zipụtere gbasara oke ogbugbu dị icheiche
Ihe mere ụfọdụ mmadụ jiri ewesara Buhari iwe bụ na ozi ya niile ọ na-ezite na eyi onwe ha.
Ha na-ekwukwa na o zipuchaa ozi ndị a ma kwechaa nkwa, ogbugbu ka na-aga n'ihu.
Lee ozi ndị o zipuru n'oge gara aga n'akara soshal midia ya ebe a:
Ụbọchị 3 ọnwa Jenụwarị afọ 2018
N'akwụkwọ ọ depụtara n'ụbọchị ahụ site n'aka onye enyemaka ya Garba Shehu, ọ katọrọ ogbugbu ndị mmadụ na Benue steeti kpọọ ya ajọ ihe.
Ụbọchị 1 ọnwa Febụwarị afọ 2018
Ụbọchị 24 ọnwa Eprelu afọ 2018
Ụbọchị 24 ọnwa Juun afọ 2018