Gọọmentị Plateau etiela iwu ọnọdụ gbata gbata

Mmadụ ruru iri na otu anwụọla na Plateau steeti n'ime ọgwụ pụtara n'etiti ndị ọrụugbo na ndị na-achị ehi n'ime obodo Gashish na Ropp na steeti ahụ.

Akukọ kwukwara na gọọmentị etiela iwu ọnọdụ gbata gbata nke akpọrọ 'State of emergency' na bekee n'obodo Riyom, Barkin Ladi na Jos saut maka mkpa mkpa a na-eme ugbua na steeti ahụ.

Ọ bụ ndị uweojii na-agụpụta ọnụ ọgụụ ndị nwụrụ, mana anya hụrụ mkpa mkpa a mere na-ekwu na ndị nwuru karị nke a.

Akụkọ na-ekwu na o nwere ndị agha nwụrụ na mkpa mkpa a, mana ọnụ na-ekwuchitere ndị agha bụ Anthony Atolagbe kwuru na ọ bụ asị.

N'ime akwụkwọ ozị onye ode akwụkwọ gọọmentị Plateau state bụ Rufus Bature zipuru ndị ntaakụkọ, o kwuru na iwu ọnọdụ gbata gbata bụ maka ị kwụsị ogbu gbu mmadụ ma-eme.

Ugbua o nweghị ndị uweojii nwuchiri maka ogbugbu a mere taa.

Akụkọ ga-amasị gị: