APC National Convention: A kụwara mmadụ atọ isi

Ebe foto si, Nigeria Presidency
N'agbanyeghị na ndị ọrụ nchekwa gbara ogige ebe a na-eme ọgbakọ ndị APC gburugburu, ọgụ dara n'etiti ndị mmadụ bịara ọgbakọ a.
Onye nta akụkọ BBC kwuru sị na ndị si Imo steeti bidoro ịlụ ọgụ; ọgụ dị n'etiti ndị kwadoro Gọvanọ Rochas Okorocha na ndị kwadoro osote ya bụ Eze Madumere.
Ka ndị nchekwa tinyere aka igbosa ha, ndị si Delta bidoro ịlụ ọgụ nke ha.
Ndị na-akwado Otega Emerhor na Victor Ochei bidoro ịlụso ndị na-akwado Sinetọ Ovie Omo-Agege ọgụ, nke butere nkụwasị oche nakwa nkụwa isi mmadụ atọ.
Ka a jụrụ ha ihe kpatara ọgụ a, ha kwuru na Omo-Agege ji ọkwa ya na-akpọbata ndị na-abụghị ezigbo ndị nnọchiteanya.
Ndị uweojii mechara kwụsị ọgụ a.
Cheta na-akpọpụtara onye bụbụ aka na-achị Edo steeti bụ Adams Oshiomhole dịka onyeisioche APC ka ndị ya na ya na-azọ oche rituru n'ụbọchị Juunu 23.
N'otu aka ahụ, Maimala Buni abụrụla onye odeakwụkwọ gburugburu nke APC.
Enweghị onye ya na ya zọrọ ọkwa a, nke bụ na ọ dị ihe bekee kpọrọ 'unopposed'.
Ndị APC mere ọgbakọ ndọrọndọrọ ọchịchị ebe ha mere ntuliaka iji họpụta ndị ga-achị ha n'ime afọ anọ na-abịa.
Nzukọ a mere n'Eagles Square dị n'Abuja, ebe ndị ọrụ nchekwa dị iche iche juru.

Ebe foto si, Presidency Nigeria
Onye ntakụkọ BBC nọ n'ọgbọ ahụ kwuru na ụzọ niile na-abata ogige ahụ kpọchichara akpọchi.
O kwukwara na ndị uweojii gwara ya na ha zipuru ihe ruru ndị ọrụ nchekwa puku ise (5000), ụgbọelu helịkọpta abụọ nakwa ụgbọala 'armoured personnel carriers' isii n'ebe ahụ.
Ndị isi APC zuru n'ebe emere ntuliaka a

Ebe foto si, Nigeria Presidency

Ndị mmadụ si mpaghara ọwụwa-anyanwụ bịa


Mana, na mbido, mmiri mere ka ọ ga-emebiri ndị APC ihe ka o bidoro n'ụtụtụ zogide ruo ehihe.

Ndị mmadụ nọdụ ala ebe mmiri agaghị ama ha, ma chere ka o zochaa tupu ha amalite ime ihe butere ha n'ọgbọ ahụ.












