You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ndị agha mmiri jidere ahịa iwu osikapa na-abata Naịjirịa
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Anwụchiela mmadụ maka ọgbugbu eze ndị Ọgbọzinne
Ndị uweojii n'Enugwu anwụchiela onye e kwuru gburu eze ndị Ọgbọzinne dị na Nkanu na steeti ahụ.
Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Danmallam Mohammed kwuru na a nwụchiri nwoke ahụ bụ Chibuike Odoh onye Mgbuji n'Ehamufu site na nchọpụta ndị uweojii n'otu nchekwa ndị ọzọ.
Naịjirịa
Mmadụ ole chọrọ oche onyeisiala?
Ntuliaka 2019 na ha ebiri ọkụ nwayọ nwayọ dịka otu onye ọzọ kwupụtakwara ebumnobi nke ya ịzọ ọkwa onyeisiala.
Onye a bụ onye chịburu Kaduna steeti bụ Ahmed Makarfi.
Ebe ọzọ na Naịjirịa
Osikapa bụkwa ahịa iwu
Ndị agha mmiri Naịjirịa kwuru na ha jidere ụgbọ mmiri na-ebubata ihe ruru akpa osikapa ruru puku abụọ site na mba Kamerun.
Cheta na gọọmenti machiri mbụbata osikapa na Naịjirịa iji nye aka kwalite ọrụ ugbo ịkọ osikapa na Naịjirịa.enug
Akụkọ mba ofesi
Ụmụnwaanyị anabataghị ụfọdụ atụmatụ Trump gụnyere nwunye ya.
Nwunye onye chịburu mba Amerịka bụ Laura Bush ekwuola okwu megide ọchịchị Trump maka atụmatụ ya gbasara ndị mbịambịa.
Nwaanyị Bush kwuru na atụmatụ ahụ na-etisa ụmụaka na nne dịka nwunye Trump kwukwara ka di ya jiri obi ya na-achị.
N'egwuregwu,
Asọmpi Iko Mbaụwa na-ebiri ọkụ.
Dịka asọmpi Iko Mbaụwa ka na-aga n'ihu, mba England ga-ezute Tunisia na mgbede taa n'otu nke G.
Brazil na Swizaland ji otu ọkpu goolu gbaa onwe ha onye laba onye laba ụnyaahụ.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa: