You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gọọmenti etiti ewetuola mbubata osikapa rue pasenti 90
Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari nọrọ na Jos dị na Plateau steeti ụnyaahụ bụ ụbọchị 9 ọnwa Maachị kwuo na ya ga-ewetu mbubata osikapa n'ala Naịjirịa rue pasenti iri itoolu.
Ọ kọwara na a ga-eji ego enwetara na ya kwado ọrụugbo, nye ndị ntorobịa ọrụ nakwa ịnapụta Naịjirịa n'ime ọnọdụ ida mba ya.
Onyeisiala Buhari kwuru nke a oge ọ gara isiobodo Plateau steeti bụ Jos imepere igwe trakịtọ narị anọ e wepụtara maka ịrụ ọrụugbo.
N'okwu ya: "Gọọmenti ga-ewetu ibubata osikapa rue pasenti iri itoolu na Naịjirịa ma jiri ego ya tinye n'ikwalite ọrụugbo iji nye ndị ntorobịa ọrụ."
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Cheta na o teela aka gọọmenti Buhari na-ekwu na ha ga-amachi ibubata osikapa na Naịjiria kpamkpam n'afọ a.
Nke a ebutala ndọrịtaụka n'akụkụ dị iche iche, dịka ndị mmadụ na-ekwu na ọ ga-ebute agụụ maka na Naịjirịa etozubeghi ịkọpụta osikapa ga-ezu mmadụ niile.