Obasanjo: Ndị Naịjirịa etinyela ọnụ n'okwu

Buhari na Obasanjo

Ebe foto si, @mbuhari Twitter

Nkọwa foto, Obasanjo chịị ala Naịjirịa afọ asatọ tupu onyefe Yar'adua
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị mmadu nọ na soshal midia Naịjirịa na-etinye ọnụ na mkpu onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo tiri na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari chọrọ ịnwụchịkọ ma bo ya ebubo maka nkatọ ọ na-eme gọọmentị ya.

Ụnyaahụ, Obasanjo sị na ozi ya nwetere na-ekwu na ndụ ya enweghịzị nchekwa makana ndịọrụ nchekwa Naịjirịa bu ya n'uche.

Obasanjo, n'ime ozi o dere, kwuru na ndị ọgba ama ya nọ na "ngalaba dị icheiche na ọrụ nchekwa Naịjirịa" na-agwa ya gọọmentị na-achọ ịgwa ndị na-ahu maka mpụ na awụwọ akpọrọ "Economic and Financial Crimes Commision" (EFCC) ka ha mepe nchọpụta banyere etu o shị chị a Naịjirịa site afọ 1999 were ruo 2007.

Obasanjo si na ọ bụ makana ya na-ekwu eziokwu ka gọọmentị jiri na-achọ ịpịchị ya ọnụ, ma gakwa n'ihu kwuo na: "Anyị nọ na obodo onye bụ nke atọ na gọọmentị bụ onye a na-emekpa ahụ, ka onye nke anọ na-ahụkwa otu ihe ahụ site n'aka gọọmentị ha na-agbara odibo."

Ọ si na ihe niile na-eme maka ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019, bụ nke enwereike ji "chụmie, merụọ ahụ maọbụ gbuo ndi mmadụ."

Mana gọọmentị Naịjirịa sala Obasanjo were si na ọ bụ sọsọ onye aka ya adịghị ọcha ga na-atụ ụjọ.

Ka ha na-agọ na ha enweghi ebunnobi ịnwụchịkọ Obasanjo, gọọmentị Naịjirịa, site n'ọnụ onye na-ekwuchitere ha bụ Lai Mohammed, jụrụ ihe mere ojiri bụru ka Buhari kwanyere MKO Abiola ugwu ka okwu a na-apụta.

O kwukwara na gọọmentị ha agaghị achụ onye ọbụla aka ya dị ọcha.

N'elu soshal midia ụfọdụ mmadụ na-etinye ọnụ na ya bu okwu, ma na akwado maọbu na akatọ Obasanjo.

Nicholas Ibekwe dere ihe dara ka nke ndị gọọmentị dere maka okwu a mgbe ọ sị na so ihe Obasanjo hụrụ ọ ga-eji me ka ndi mmadu chefuo ihe Buhari mere Abiola na ndị ọzọ bụ ịsị na a na-achụ ya.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ka @nnekei dere okwu ụfọdụ si na Obasanjo kwuru mgbe Buhari na-azọ ọchịchị na 2015, iji gosi na ọ dika ihe okwuru mgbe ahụ na-eme ụgbụa.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ka @Ediong na-akọwa na-ọdịghị mfe ịnwụchị onye bụbụ onyeisiala, maka ọ bụru na ọ bu etu a, Goodluck Jonathan ga a nọ na mkpọrọ.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ka otu pati "Peoples Democratic PARTY" (PDP) bụ ndị Obasanjo jiri akara ha chịa Naịjirịa sị na ihe a o kwuru na-atụ ajọ egwu, makana ọ dịzị ka Naịjirịa bụ ebe onye ekwenyeghị na Buhari ga-enwe nsogbu.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Gimba Kakanda dere na okwu Obasanjo dị ka okwu onyeisi ndị omeiwu Naịjirịa bụ Olusola Saraki mechara nwe eziokwu, dika onwere ndị kpọrọ aha ya mere ndị uweojii jiri si ya zara aha ya.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Ihu na azụ a ka na-aga n'ihu na soshal midia, nke mere aha Obasanjo jiri na-ewu na Twitter.