You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ebola: FAAN ga-ebido nyocha ahụ zuruoke n'ọdọ ụgbọelu
Ọdọ ụgbọelu nke ofesi ndị a gunyere Murtala Muhammed International Airport dị na Lagos, Nnamdi Azikiwe International Airport, Abuja, Mallam Aminu Kano International Airport, Kano, na Port Harcourt International Airport.
FAAN kwuru na o na-eme nyocha a n'ụlọ ugbọelụ ndị a maka na ha bụ ebe ndị mmadụ na-ejupute karicha.
Onyeisi FAAN nke nta bụ Sani Mahmud kwuru na kemgbe enwechara mwakpo ọrịa Ebola na 2014, ngalaba ahụ akwụsịbeghị ị nyocha ndị njem maka adịghị amaama.
N'otu aka ahụ, osote onyeisi nakwa onyeisi ụlọọgwụ na FAAN bụ Adamu Adamu kwuru na ụgbụa ha enweela nhazị gbasara ahụike ọha n'ụlọ ụgbọelụ.
N'ọnụ ya, ''anyị nọ n'oge ike nkwụcha ya mere anyị ji enyocha ọnọdụ ahụ, ka onye si aga njem na mbu ọkachasị nakwa anyi welitela aka n'idiọcha tumadị n'ihe gbasara ụlọ ndị mmadụ n'eje mposi.''
''Anyi nwere ude na-achụ nje nke akpọrọ ''sanitisers'' n'akụkụ dị iche iche ka wee hụ na ndị njem ọbụla na-abata Naịjirịa ga-ewere ya hicha aka. Anyi nwekwara mgbasa ozi gbasara ahụike nke ọha.''
''Anyi na ndị ụlọọrụ ọdọ ụgbọmmiri dị na obodo a ga-ejikọkwa aka wee hụ na ya bụ ọrịa Ebola abataghị na Naịjirịa.''