You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kenya ga-eji mashin na-enyocha asị chụọ mpụ
Ndị welitere isi na-arụrụ gọọmenti Kenya ọrụ ga-agaferiri mashin na-enyocha asị dịka otu ihe n'ime ụzọ iji chụọ mpụ ọsọ bụ ihe onyeisiala ha bụ Uhuru Kenyatta kwuru.
Kenyatta kwuru na nyocha ahụ nke ga-egosi ma aka onye ọrụ ahụ adị ọcha bụ naanị otu n'ime ihe ndị a ga-eme iji chụọ nsogbu mpụ ọsọ.
O kwuru okwu a oge e gosipụtara na ihe ruru ijeri asato ego shịlịn Kenya na-efu site n'aka otu ngalaba gọọmenti.
A na-atụ ndị ọrụ mmadụ 40 aka na ha zuru ego ahụ.
Ndị gosipụtara mpụ ahụ bụ ndị na-ebutere ha ihe hụrụ ego e jiri ngalaba National Youth Service (NYS) n'aha ịchafụ zuo nke e gosipụtara akwụkwọ adịgboroja nakwa ebe a kwụrụ ụgwọ ugboro ugboro.
A na-ahụta nyocha ahụ a na-eme NYS nke so n'ihe Kenyatta chọrọ iji mepee ọrụ dịka ụra ka a mara nkwa Kenyatta kwere ịchụ mpụ ọsọ oge e nyere ọchịchị mbụ n'afọ 2013.
Okwu Kenyatta dịka ọ bụ iji buru ụzọ na ya bụ nsogbu.