Onye ọkaiwu Kenya arituola n'oche

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onye bu onye isi ọkaiwu na Kenya bụ Prof Githu Muigai aritola n'oche.

Onyeisiala Kenya bụ Uhuru Kenyatta sị na ya ejighi obị ọcha nabata akwụkwọ Muigai jiri si ya na ya adịghị arụzi ọrụ.

Prof Muigai, bụ onye rụrụ ọrụ ka okaiwu na Kenya kemgbe afọ isii, pụtara na akụkọ na nso ka ọ na ekwu na ọ ga akụ onyeisi ndi na-anọghi n'ọchichi bu Raila Odinga ebubo ka onye na ebuso obobo agha ma ọ ṅụọ iyi ka onyeisiala Kenya.

Kenyatta ewepụtala ọkaikpe Paul Kihara Kariuki ka onye ọzọ ga anọchite anya Muigai.