You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Serena Williams awakela ọzọ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Serena Williams awakela ka anyanwụ ọzọ
Agbara nwaanyị na egwuruegwu tennis bụ Serena Williams sị ụwa chere aka ghọrọ ya na ọdịnihụ.
Serena bụ onye meriri Ashleigh Barty nke mba Australia sị na ya ga-emecha sịe ike karịa ka ya dị bụ tupu ya amụọ nwa bụ nke sechituru ya nwaazụ na-egwu.
Rochas anọghị n'ọgbakọ APC
Achọrọ Owelle Rochas achọ na ọgbakọ ndị APC n'Abụja ụnyahụ ebe ọtụtụ ndị isi ọzọ ndị pati ahụ zuru na ya bụ ọgbakọ
Owelle sị na ya bụ ọgbakọ ezughi oke ma ya bụ onyeisi pati ahụ na ọwụwa anyanwụ a nọghị ya. Cheta na Rochas na ndị pati ya malitere ịnwe ọgbaghara nsonso a.
Boko Haram agbuola ndịagha ise na Boronu
Na Boronu steeti unyahụ, ndị Boko Haram wakporo ma ta isi ndị agha Naịjirịa ise.
Texas Chukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa kwuputara nke a mgbe ọ sị na ndị omekaome a basara ndị agha operation Lafia dole ọgụ mgbe ihe a mere.
Nkatọ esochiela mbuli ụtụisi ngwa ahịa igwe Trump
Nkatọ esochiele ụtụisi nke onyeisiala Trump nke Amerịka tinyere na-azụm ahịa igwe ndị mba ọzọ.
Trump weliri ụtụisi ngwa ahịa na-aka mba EU, Canada na Mexico bụ ndị fooro ntutu ta na ha ga abọrọ mbọ.
Gee nkeji ụtụtụ tata:
Ihe nkiri nke taa: