You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọrịa Kọlera esenyiela isi ọzọ na mpaghara Naịjirịa
Ụfọdụ obodo dị na mpaghara ugwu Naịjrịa jisike agba ọrịa kọlera mgba ebe e kwuru na o gburu mmadụ irị atọ na otu nakwa ihe ruru otu nde mmadụ bu ya kemgbe Febụwarị.
A na-achọpụta ndị ohuru bu ya n'obodo Borno, Yobe na Adamawa ka ọnụọgụgụ ya na-arị elu n'ụbọchị ole na ole gara aga.
N'Adamawa, ihe ruru mmadụ narị anọ na iri asatọ n'abụọ bụ ihe bu orịa a ebe akụkọ na-ekwu na o gbuola mmadụ iri n'atọ rue ugbua.
Njem ọrịa a na Yobe steeti bidoro na ngwụcha ọnwa Maachị gburu mmadụ iri n'ise ebe mmadụ narị anọ n'anọ bu ya mgba agụrụ ọnụ n'ụbọchị 21 May.
A nụrụ akụkọ ya kemgbe ọnwa Febụwarị n'obodo Kukawa dị na Borno steeti ebe o fere mmadụ iri n'itoolu.
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na-efe kwuru na udu mmiri so n'ihe ofufe ọrịa kọlera a jiri rịa elu.
Mana na mbido ọnwa a, ọgbakọ mba ụwa niile akpọrọ UN na Bekee site n'usoro bụ Nigeria Humanitarian Fund' kewapụ nde dọlla abụọ iji kwado ọrụ ị gbochi ofufe ọrịa Kolera na mpaghara ugwu Naịjirịa nwere ike ị gbu puku mmadụ ole na ole.