You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Iba Lasa eriela ndụ otu onye ọrụ ahụike n'Ondo
Otụ onye ọrụ ahụike na-arụ n'ụlọ nyocha ọrịa n'Ondo steeti anwụọla site n'ọrịa e chere na ọ bụ Iba Lasa.
Rasheedat Mohammed nwụrụ n'ụbọchị satode ebe ndị ibe ya na-akọwa na o si njem ọ gara na Pọtakọt(Port-Harcourt) lọta.
Akụkọ kwuru na onye ọ gara ịhụ nwụkwara site n'ọrịa a.
Ebe ndị ọrụ ahụike na-akpọ ndị isi ụlọọgwụ ahụ oku ka ha wega ọbara ha n'ụlọọgwụ Irrua nke dị na Edo steeti maka nyocha zuru oke.
A na-akọwa na ndị isi ụlọọgwụ ahụ anaghị enye ha mgbochi kwesiri ekwesi maka ịgwọ ndị bu ọrịa ahụ.
Kọmịshọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Wahab Adegbenro kwuru na onweghị onye ọbụla na-arịa Iba Lasa na steeti ahụ.
Ebe dọkịta ukwu n'ụlọọgwụ ahụ bụ Akinwunmi Akinbodewa na-ekwu na ọ bụ ọrịa umeju gburu Rasheedat na ọ bụghị iba Lasa.
Otu onye ọkachamara na-ekwu ebe a ụzọ dị ịcheịche a ga-eji gbochi ọrịa ahụ ịmetụta gị: