Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Kim Yong-Chol abatala Amerịka
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Anwụchịrị ndị chọrọ ime ngagharị iwe n'Enugu

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii anwụchiela mmadụ iri abụọ ha kpọrọ ndị otu Biafra Zionists Federation, gụnyere onye isi ha a na-akpọ ọkaiwu Benjamin onwuka n'Enugwu ụnyaahụ.
Ha nwụchiri ndị a mgbe ha chọrọ iji aka ike banye n'ogige ụlọ gọọmentị Enugwu
Aka akparala ndị ọkwa ha gbagotere na Kaduna
Ndị EFCC anwụchiela Alhaji Ramalan Yero wụbụ gọvanọ ndị Kaduna, Abubakar Gaya-Haruna bụbu onyeisioche ndị PDP, Hamza Ishaq bụbu odeakwụkwọ gọọmentị Kaduna nakwa Nuhu Somo bụbu minista.
A nwụchiri ha maka ebubo mmerụaka gbasara nde Naịra narị asaa na iri ise so n'ego ndị PDP ji mee mgbasaozi na ndọrọndọrọ ọchịchị 2015.
Akụkọ mba ofesi;

Ebe foto si, AFP
Aka Ikenga Kim Jong-Un bụ onyeisiala mba North Korea na Mike Pompeo bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta Amerịka na mba ofesi, ezukọọla na New York.
Ọbịbịa Kim Yong-Chol ga-eme ya mbụ onye ọkwa ya gbagotere na North Korea ga-abịa Amerịka n'ime ihe ruru afọ iri abụọ.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Onye nchịkọta ndị otu Super Eagles bụ Gernot Rohr kwuru na Ikeme nwere ike iso ha aga iko mbaụwa na Rọshịa ma bụrụkwa onye otu ha a na-akwanyere ugwu.
Cheta na a chọtara ọrịa Leukaemia n'ahụ Ikeme bụ aka na-echere Naịjirịa goolu, n'afọ gara aga.
Gere akụkọ mere n'utụtụ a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:










