Onye uweojii egbuola onye agha na Port Harcourt

Ebe foto si, Getty Images
Ndị mmadụ chere aka ịghọrọ ihe nwere ike ịdapụta n'etiti ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa ka otu onye uweojii gbagburu onye agha n'ihi na o chere na "ọ bụ onye ohi."
Akụkọ kwuru na ihe a mere n'akụkụ ụlọọrụ ndị uweojii dị na Rumukpakani n'ụbọchị 17 Mee, 2018.
Otu onye bi ebe ahụ gwara ndị ntaakụkọ TheCable na "ụfọdụ ndị agha nọrọ n'ụlọ nkwari akụ dị nso ụzọ Ada George. Mmadụ abụọ n'ime ha pụtara ka ha zụta nri, mana otu bu egbe n'agbanyeghị na ha eyighi uwe ọrụ ha. Oge ndị uweojii bịara, ha gwara ndị agha ahụ soro ha gaa n'ụlọọrụ ha mana ha jụrụ, nke butere nrụrịtaụka n'etiti ha.
Otu n'ime ndị uweojii gbara onye agha egbe ma gbagbuo ya, ebe onye nke ọzọ ghaghachiri azụ ịgwa ndị otu ha."
Ndị ntaakụkọ Vanguard kwuru na Zaki Ahmed bụ kọmishọna ndị uweojii na Rivas steeti kwenyere na ihe a mere.
O kwuru "Ọ bụ ihe ọjọọ, mana ọ bụghị eziokwu na ndị agha na-achụ ndị uweojii."
Akụkọ kwuru na ndị uweojii na-arụ na Rumukpakani agbafuola maka ụjọ na-atụ ha na ndị agha nwere ike ịbịaghachị luso ha agụ.
Ọtụtụ mgbe ndị agha na ndị uweojii na-enwe ezigbote nsogbu na Naịjirịa, ụfọdụ nke butere ogbugbu mmadu.

Akụkọ ga-amasị gị:










