Ụlọikpe amachiela EFCC na DSS ịchọ ihe n'ụlọ Wike

Ndị uweojii Naijiria

Ebe foto si, AFP

Ụlọikpe ukwu nọ n'Abụja amachiela ndi uweojii, ndị DSS na ndị EFCC ị gaa n'ụlọ aka na-achị Rivers steeti bụ Nysom Wike maka ịchọ ihe ọbụla.

Ọkaikpe Ahmed Mohammed bu onye nyere iwu a n'ụbọchị Wenesde mgbe okwuru na agaghị enye ha akwụkwọ ka ha ga chọọ ihe n'ụlọ ndị Wike nwere makana o nwere ikike machiri inyocha ya maka ọ bụ gọvanọ. Ihe bụ ihe iwu ala Naịjirịa kwuru.

N'afọ 2017, Wike gara ụlọikpe ka o nwete ikike ga-amachi onyeisi ndị uweojii, ndị EFCC na ndị DSS i nweta akwụkwọ ga-enye ha ikike ị ga n'ụlọ ya ga mee nyocha.

Mana ndị a akpọrọ aha kwuru na ha nwere ikike ị ga ụlọ Wike.

Ka Ọkaikpe Mohammed na nye ikpe ya, ọ tụrụ aka na ndị a akpọrọ aha kwenyere na ihe Wike kwuru na ihe iwu ala kwuru bụ na agaghị eme ya nyocha.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ