Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Mmadụ 26 anwụọla maka referandum
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii anwụchiela mmadụ anọ a na-enyo enyo maka izu akwụkwọ ntuliaka ime ụlọ nke APC n'Imo steeti.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Jimoh Moshood, kwuru na a nwụchiri ha n'otu ụlọ oriri dị n'Abuja, site n'ama mmadụ gbaara ha.
Nwata akwụkwọ Dapchi Boko Haram ji

Ebe foto si, Isaac Linus Abrak
Onyeisi otu jikọrọ ụka ọgbara ọhụrụ na Naijiria nke a kpọrọ PFN n'aha ịchafụ bụ Felix Omobude, agwala gọọmenti etiti ka ha kwụọ ụgwọ ma gbapụta Leah Sharibu, bụ nwata akwụkwọ Dapchi ndị Boko Haram kpachiri.
Cheta na ndị Boko Haram ka ji Leah Sharibu bụ otu n'ime ụmụaka ụmụnwaanyị dị 110 ndị Dapchị dị na Yobe steeti ha tọọrọ n'ọnwa Februari 19, n'ihi na o kwenyeghị ịjụ Kraịst.
N'akụkọ mba ofesi

Ebe foto si, AFP
Ihe ruru mmadụ iri abụọ na isii nwụrụ ka ndị omekome wakporo obodo Cibitoke dị na mba Burundi, ụnyaahụ.
A na-ekwu na ndị a bu egbe na mma ma gbakwaa ụlọ ndị mmadụ ọkụ, kpara mkpamkpa a iji mebisia referandum nke nwere ike ime ka onyeisiala ha bụ Pierre Nkurunziza bidoro ịchị kemgbe afọ 2005 chịa ruo afọ 2034.
N'Egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Taa ka asọmpi premier league nke afọ 2017/2018 ga-agwụ.
Ihe ọ pụtara bụ na otu Chelsea na Liverpool ga-azọ ọnọdụ ọkwa anọ, nke ga-enye ha ohere ịsọ mpi Champions League nke afọ na-abịa.
N'akụkọ ọzọ, Alex Kibet, onye Kenya, bụ onye meriri n'ọsọ Okpekpe a gbara n'Edo steeti na Satode.
Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a:











