You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Uweojii ga-enyocha isi mmadụ puku 130 chọrọ iso ha rụọ ọrụ
Ndị uweojii Naịjirịa kwuru na ha ga-enyocha isi mmadụ puku 130 chọrọ isolo ha rụọ ọrụ.
Osote onyeisi ndị uweojii Naịjirịa niile nke na-ahụ maka nkuzi ndị uweojii, kwuru nke a ka ha na-amalite usoro mkpọbata ndị ọhụrụ n'Abuja.
O kwuru na ihe kpatara a ga-eji nyochaa isi ha bụ ka a hụ na onweghị ndị nke na-aṅụ ọgwụ ike na-eri isi.
Ihe ruru mmadụ puku otu narị na iri atọ (130,000) tinyere akwụkwọ ịbanye ọrụ uweojii bụ ndị a họpụtara a ga-enyocha isi ha, ebe mmadụ puku isii (6000) bụ ndị uweojii na-ele anya iwe n'ọrụ dịka Kọnstable.
Ọ bụghị naanị isi ka a ga-enyocha ha, a ga-enyochakwa ahụ ha iji mara ma ha e nwere obiri n'aja ọcha (HIV), ebe a ga-enyocha ma e nwere ndị nke nwaanyị dị ime.
Ndị uweojii na-ekwu na ha enweghị mmadụ ole zuru ịhụ maka nchekwa mmadụ ruru nde abụọ (m200).
Ndị mmadụ na-ajụ ma a ga-enyochakwa isi ndị uweojii ndị nke nogoro n'ọrụ ugbua maka mmekpa ahụ ha na-eme ụfọdụ ndị Naịjirịa.
BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Jimoh Moshood n'ekwentị ka e nwee ike ịgba ya ajụjụ ọnụ maka nyocha a, mana ọ zaghị.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: