You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Njem Buhari: Ndị Naịjiria etinyela ọnụ na okwu
Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-ahapụ Abuja taa gawa Lọndọn dịka dọkita ya gwara ya bịa maka nyocha ahụike ya.
Buhari ga-anọ mkpụrụ ụbọchị anọ na njem ya.
Nke a na-esote njem o mere n'afọ gara aga ebe ọ fọrọ nwa obere ihe ka ọ nọkarịa mkpụrụ ụbọchị 100 nke butere ndọrịtaụka gbasara ihe akwụkwọ iwu kwuru.
Ugbua, o kwuru na ya ga-anọ mkpụrụ ụbọchị anọ mana ụfọdụ ụmụ Naịjirịa anabataghị ya bụ njem nke ọma.
Ọtụtụ n'ime ha rụtụrụ aka n'okwu ya na mbụ ebe ọ gwara ndị ụlọ Chatham na Lọndọn na ya agaghị eme njem ahụike maka na ya ga-arụzị ahụike na Naịjiria.
Onye kpọrọ onwe ya Slim Berry na Twitter, wepụtara akụkụ akwụkwọ ebe Buhari kwuru ihe a n'akwụkwọ ọ gụpụtara na Chatham n'afọ 2015.
Onye kpọrọ onwe Whyte n'akụkụ nke ya na-ajụ ihe kpatara na Buhari kwuru na ya agaghị eme njem gaa mba ofesi na-atụfụ ọtụtụ ego na ya.
N'akụkụ nke ya, Hayatu kelere onyeisiala Buhari na ọ na-agbalị ịchị Naịjirịa agbanyeghi etu ahụ ya dị ya.
N'akụkụ nke ya, Precious kwuru na ọ bụrụ na Buhari enweghi ike imezi ụlọọgwụ onyeisiala dị n'Abuja, kedụ etu ọ ga-esi mezie ahụike na Naịjirịa. Ọ jụkwara ha ihe kpatara o jiri chọọ ịzọ ọchịchị ọzọkwa n'afọ 2019 ma o meghi ihe ndị o kwere na nkwa.
Otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Okey Odogwu kwuru na ọ dị mkpa na onyeisiala dịka mmadụ gara nata ahụike.
Mana o kwuru na njem ya akarịala ma bụrụ nsogbu na Naịjirịa karịa asịsa nye nsogbu ụmụ Naịjirịa.
N'okwu ya, "Nsogbu ụmụ Naịjirịa karịrị nke ahụike onyeisiala ekwesighi iso na ya mana mmadụ kwuo, a sị na ọ bụ ndọrọndọrọ ọchịchị.
"Onyeisiala akatala ahụ, o kwesiri ị na-arịa ọarịa, mana ihe ọ kara ime bụ iji aka ya jiri nwayọọ ritue ma la ezumikenka n'onwe ya."
N'aka nkeọzọ onyeisi ndị APC n'Enugwu steeti bụ Ben Nwoye kwuru na ndị na-ajụ ihe onyeisiala na-emere njem maka ahụike ya bụ ndị omekome na ndị PDP.
Nwoye kwuru na Buhari bụ agadi nwoke kwesiri ileta onwe ya anya ma na enyefekwa osote ya ọchịchị ma ọ chọọ ime njem.
Nwoye sị, "Ndị na-ekwu ihe a bụ nd i a napụrụ ọchịchị na-ebe akwa na-anara ha ọchịchị.
"Buhari na-enyefe osote ya ọchịchị ma ọ chọrọ ịga ebe ọbụla, nke a gosiri na ọ na-eme ihe ziri ezi maka na ọ gwara ụwa niile na ya ejighi ahụ."